1 Ndị Eze 18

Nʼihi nke a, Ehab sitere nʼebe ahụ pụọ gaa iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma Ịlaịja rigooro nʼelu ugwu Kamel gbuo ikpere nʼala, kpuokwa ihu ya nʼala nʼetiti ikpere ya abụọ ikpe ekpere.

1 Kings 18:42 (UKJV) So Ahab went up to eat and to drink. And Elijah went up to the top of Carmel; and he cast himself down upon the earth, and put his face between his knees,

40Mgbe ahụ, Ịlaịja nyere ha iwu sị, “Jidenụ ndị amụma Baal niile. Unu ekwekwala ka otu onye nʼime ha laa.” Ha jidekwara ha niile. Ịlaịja dukwaara ha niile gaa na ndagwurugwu iyi Kishọn, gbuo ha nʼebe ahụ.

41Emesịa, Ịlaịja gwara Ehab okwu sị, “Gaa rie nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ; nʼihi na anụrụ m ụzụ oke mmiri ozuzo ka ọ na-ada.”

42Nʼihi nke a, Ehab sitere nʼebe ahụ pụọ gaa iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma Ịlaịja rigooro nʼelu ugwu Kamel gbuo ikpere nʼala, kpuokwa ihu ya nʼala nʼetiti ikpere ya abụọ ikpe ekpere.

43Nʼoge a, ọ gwara nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Gaa lee anya nʼụzọ oke osimiri.” Ọ rịgoro lee anya, sị, “Ọ dịghị ihe ọbụla m hụrụ.” Ịlaịja gwakwara ya otu a, ugboro asaa, sị ya, “Jeghachi.”

44O ruo na nke ugboro asaa, nwokorobịa ahụ bịaghachiri sị Ịlaịja, “Onyenwe m, ahụrụ m igwe ojii dị nta dịka ọbụ aka mmadụ ka o si nʼoke osimiri na-apụta.” Ya mere, Ịlaịja sịrị, “Gaa gwa Ehab, ‘dozie ụgbọ agha gị, gbadaa tupu mmiri ozuzo egbochi gị ịla.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.