38Mgbe ahụ, na mberede, ọkụ Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe daa, rechapụ oke ehi ahụ, na nkụ ahụ, na nkume, na ntụ, ma rechapụkwa mmiri niile dị nʼime olulu ahụ dị gburugburu ebe ịchụ aja ahụ.
39Mgbe ndị mmadụ ahụ niile hụrụ ihe a mere, ha niile dara nʼala kpuo ihu nʼala, na-eti mkpu na-asị, “Onyenwe anyị, ya onwe ya bụ Chineke! Onyenwe anyị ya onwe ya bụ Chineke!”
40Mgbe ahụ, Ịlaịja nyere ha iwu sị, “Jidenụ ndị amụma Baal niile. Unu ekwekwala ka otu onye nʼime ha laa.” Ha jidekwara ha niile. Ịlaịja dukwaara ha niile gaa na ndagwurugwu iyi Kishọn, gbuo ha nʼebe ahụ.
41Emesịa, Ịlaịja gwara Ehab okwu sị, “Gaa rie nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ; nʼihi na anụrụ m ụzụ oke mmiri ozuzo ka ọ na-ada.”
42Nʼihi nke a, Ehab sitere nʼebe ahụ pụọ gaa iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma Ịlaịja rigooro nʼelu ugwu Kamel gbuo ikpere nʼala, kpuokwa ihu ya nʼala nʼetiti ikpere ya abụọ ikpe ekpere.