1 Ndị Eze 18

Mgbe ndị mmadụ ahụ niile hụrụ ihe a mere, ha niile dara nʼala kpuo ihu nʼala, na-eti mkpu na-asị, “Onyenwe anyị, ya onwe ya bụ Chineke! Onyenwe anyị ya onwe ya bụ Chineke!”

1 Kings 18:39 (UKJV) And when all the people saw it, they fell on their faces: and they said, The LORD, he is the God; the LORD, he is the God.

37Biko, Onyenwe anyị m, zaa m ekpere m, zaa m ya, ka ndị Izrel niile mata na gị onwe gị, Onyenwe anyị bụ Chineke, na gị onwe gị na-atụgharịkwa obi ha ịlaghachikwute gị.”

38Mgbe ahụ, na mberede, ọkụ Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe daa, rechapụ oke ehi ahụ, na nkụ ahụ, na nkume, na ntụ, ma rechapụkwa mmiri niile dị nʼime olulu ahụ dị gburugburu ebe ịchụ aja ahụ.

39Mgbe ndị mmadụ ahụ niile hụrụ ihe a mere, ha niile dara nʼala kpuo ihu nʼala, na-eti mkpu na-asị, “Onyenwe anyị, ya onwe ya bụ Chineke! Onyenwe anyị ya onwe ya bụ Chineke!”

40Mgbe ahụ, Ịlaịja nyere ha iwu sị, “Jidenụ ndị amụma Baal niile. Unu ekwekwala ka otu onye nʼime ha laa.” Ha jidekwara ha niile. Ịlaịja dukwaara ha niile gaa na ndagwurugwu iyi Kishọn, gbuo ha nʼebe ahụ.

41Emesịa, Ịlaịja gwara Ehab okwu sị, “Gaa rie nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ; nʼihi na anụrụ m ụzụ oke mmiri ozuzo ka ọ na-ada.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.