1 Ndị Eze 18

Ha kere ala ahụ nʼetiti onwe ha. Ehab sitere otu akụkụ, ma Ọbadaya sitere akụkụ nke ọzọ.

1 Kings 18:6 (UKJV) So they divided the land between them to pass throughout it: Ahab went one way by himself, and Obadiah went another way by himself.

4Mgbe eze nwanyị bụ Jezebel na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị chọọ igbuchapụ ha, ọ bụ Ọbadaya zoro narị ndị amụma nʼime ha nʼime ọgba nkume. O zoro iri ndị amụma ise nʼotu ọgba nkume, zookwa iri ndị amụma ise fọdụrụ nʼime ọgba nkume ọzọ. Emesịa, ọ na-ewegara ha nri na mmiri nʼebe ahụ.)

5Ehab kpọrọ Ọbadaya sị ya, “Jegharịa nʼala a niile nyochapụta na ndagwurugwu na isi iyi niile, ebe ahịhịa ndụ dị. Gbutere ịnyịnya na ịnyịnya muul m ahịhịa ahụ ka ha taa ghara ịnwụ, ka anyị gharakwa igbu ha.”

6Ha kere ala ahụ nʼetiti onwe ha. Ehab sitere otu akụkụ, ma Ọbadaya sitere akụkụ nke ọzọ.

7Ọ dịghị anya, na mberede, Ọbadaya hụrụ Ịlaịja ka ọ na-abịa izute ya. Ọbadaya matara na ọ bụ ya. Nʼihi ya, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala sị, “Ọ bụ gị ka m hụrụ nʼezie, onyenwe m, Ịlaịja?”

8Ịlaịja zara sị ya, “E, ọ bụ m. Ugbu a gaa gwa onyenwe gị, ‘mụ bụ Ịlaịja nọ nʼebe a.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.