6Ha kere ala ahụ nʼetiti onwe ha. Ehab sitere otu akụkụ, ma Ọbadaya sitere akụkụ nke ọzọ.
7Ọ dịghị anya, na mberede, Ọbadaya hụrụ Ịlaịja ka ọ na-abịa izute ya. Ọbadaya matara na ọ bụ ya. Nʼihi ya, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala sị, “Ọ bụ gị ka m hụrụ nʼezie, onyenwe m, Ịlaịja?”
8Ịlaịja zara sị ya, “E, ọ bụ m. Ugbu a gaa gwa onyenwe gị, ‘mụ bụ Ịlaịja nọ nʼebe a.’ ”
9Mgbe ahụ, Ọbadaya jụrụ Ịlaịja sị, “Gịnị bụ ihe m mejọrọ, nke mere i ji na-achọ inyefe ohu gị nʼaka Ehab ka o gbuo ya?
10Dịka Onyenwe anyị Chineke gị sị adị ndụ, o nwebeghị mba maọbụ alaeze dị nke nna m ukwu na-ezigaghị mmadụ ịchọ gị. Ebe ọbụla ọ gara a na-akọrọ ya na Ịlaịja anọghị nʼebe ahụ. Ehab na-eme ka eze obodo ahụ ṅụọ iyi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.