1 Ndị Eze 19

Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a, ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.”

1 Kings 19:10 (UKJV) And he said, I have been very jealous for the LORD God of hosts: for the children of Israel have forsaken your covenant, thrown down yours altars, and slain your prophets with the sword; and I, even I only, am left; and they seek my life, to take it away.

8Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb nke bụ ugwu Chineke.

9Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼotu ọgba nkume rahụ ụra abalị nʼime ya. Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”

10Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a, ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.”

11Onyenwe anyị sịrị ya, “Pụọ gaa guzo nʼelu ugwu, nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị na-aga isite nʼebe ahụ gafee.” Mgbe ahụ, oke ifufe dị ike gbawara ugwu ahụ, tipịasịa nkume ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ifufe ahụ. Mgbe ifufe ahụ gasịrị, e nwere oke ala ọma jijiji nʼugwu ahụ, ma Onyenwe anyị anọkwaghị nʼala ọma jijiji ahụ.

12Mgbe ala ọma jijiji ahụ gasịrị, ọkụ nwuuru, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ọkụ ahụ. Ma mgbe ọkụ ahụ gasịrị, nwa olu nta dị nwayọọ dara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.