1 Ndị Eze 19

Onye ọbụla gbanarịrị Hazael ga-anwụ nʼaka Jehu. Otu a kwa, ndị niile gbanarịrị mma agha Jehu ka Ịlaisha ga-egbu.

1 Kings 19:17 (UKJV) And it shall come to pass, that him that escapes the sword of Hazael shall Jehu slay: and him that escapes from the sword of Jehu shall Elisha slay.

15Onyenwe anyị sịrị ya, “Sikwa ụzọ i si bịa laghachi, gaa nʼọzara Damaskọs. Mgbe i ruru ebe ahụ, tee Hazael mmanụ ịbụ eze Aram.

16Teekwa Jehu, nwa Nimshi mmanụ ịbụ eze Izrel. Ị ga-etekwa Ịlaisha nwa Shafat, onye Ebel-Mehola mmanụ ịbụ onye amụma nʼọnọdụ gị.

17Onye ọbụla gbanarịrị Hazael ga-anwụ nʼaka Jehu. Otu a kwa, ndị niile gbanarịrị mma agha Jehu ka Ịlaisha ga-egbu.

18Ma ghọta na ọ dị puku mmadụ asaa nọ nʼIzrel, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal, maọbụ sutu ya ọnụ, ife ya ofufe.”

19Ịlaịja sitere nʼebe ahụ pụọ gaa chọta Ịlaisha nwa Shafat ebe ọ nọ na-akọ ala ubi. Iri ehi abụọ na anọ e jikọtara abụọ abụọ dị ya nʼihu, ma ya onwe ya ji ehi abụọ e jikọtara ọnụ, nke iri na abụọ ya na-akọ ala ubi. Ịlaịja jekwuru Ịlaisha wụkwasị ya uwe mwụda ya nʼubu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.