1 Ndị Eze 19

Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị bịaghachikwara nke ugboro abụọ, sị ya, “Bilie rie ihe, nʼihi na ije dị gị nʼihu dị ukwuu.”

1 Kings 19:7 (UKJV) And the angel of the LORD came again the second time, and touched him, and said, Arise and eat; because the journey is too great for you.

5O dinara nʼokpuru osisi brum rahụ ụra. Ma lee, otu oge ahụ, mmụọ ozi metụrụ ya aka, sị ya, “Bilie, rie nri.”

6Ịlaịja biliri legharịa anya, hụ ogbe achịcha na ite mmiri nta nke dị nʼakụkụ ebe ọ tụkwasịrị isi ya. O riri ogbe achịcha ahụ a hụrụ nʼicheku ọkụ, ṅụọkwa mmiri ahụ. Emesịa, o dinakwara ọzọ.

7Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị bịaghachikwara nke ugboro abụọ, sị ya, “Bilie rie ihe, nʼihi na ije dị gị nʼihu dị ukwuu.”

8Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb nke bụ ugwu Chineke.

9Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼotu ọgba nkume rahụ ụra abalị nʼime ya. Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.