1 Ndị Eze 2

Benaya banyere nʼime ụlọ nzute Onyenwe anyị, sị Joab, “Eze sị gị, ‘pụta ezi!’ ” Ma ọ zara, “Mba, aga m anwụ nʼebe a.” Nʼihi nke a, Benaya jekwuru eze gwa ya ihe Joab kwuru.

1 Kings 2:30 (UKJV) And Benaiah came to the tabernacle of the LORD, and said unto him, Thus says the king, Come forth. And he said, Nay; but I will die here. And Benaiah brought the king word again, saying, Thus said Joab, and thus he answered me.

28Ma mgbe Joab nụrụ na Adonaịja anwụọla, ọ gbaara ọsọ gaa nʼụlọ nzute Onyenwe anyị jigide mpi dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja aka. Ọ bụ ezie na Joab so Adonaịja gbaa izu imegide Solomọn, ma o soghị Absalọm gbaa izu imegide Devid.

29Mgbe a gwara eze Solomọn, na Joab a gbabala nʼụlọ ikwu Onyenwe anyị, nọdụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja. Solomọn nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu sị, “Gaa, tituo ya nʼala.”

30Benaya banyere nʼime ụlọ nzute Onyenwe anyị, sị Joab, “Eze sị gị, ‘pụta ezi!’ ” Ma ọ zara, “Mba, aga m anwụ nʼebe a.” Nʼihi nke a, Benaya jekwuru eze gwa ya ihe Joab kwuru.

31Mgbe ahụ, eze nyere Benaya iwu sị ya, “Gaa mee dịka o kwuru. Gbuo ya, liekwa ya. Nke a ga-eme ka ikpe ọmụma ghara ịdịrị mụ na ezinaụlọ nna m Devid nʼihi ikpe ọmụma dịrị Joab maka ọbara ndị aka ha dị ọcha ọ wụsiri.

32Onyenwe anyị ga-emekwa ka ọbara ọ wụsiri laa ya nʼisi, nʼihi na o ji mma agha gbuo ndị ikom abụọ, ma nna m Devid amaghị maka ya. Ha abụọ, ya bụ Abna nwa Nea, ọchịagha ndị Izrel, na Amasa nwa Jeta, ọchịagha ndị Juda, ndị dị mma ma bụrụkwa ndị ezi omume karịa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.