1Ugbu a, Ben-Hadad, bụ eze ndị Aram, chịkọtara ndị agha ya niile. Iri ndị eze atọ na abụọ sonyere ya, ha na ịnyịnya ha na ụgbọ agha ha. Ọ rịgooro nọchibido obodo Sameria buso ya agha.
2Mgbe ahụ, eze ndị Siria zigaara Ehab, eze Izrel ozi nʼime obodo sị ya, “otu a ka Ben-Hadad sịrị,
3‘Ọlaọcha na ọlaedo gị, nkem ka ha bụ, ndị nwunye gị na ụmụ gị, bụ ndị dị mma karịsịa nke m ka ha bụ.’ ”