1 Ndị Eze 20

Emesịa, onye amụma ahụ bịakwutere eze Izrel sị ya, “Mee onwe gị ka ị dị ike nke ọma, mara ihe e kwesiri ka e mee, nʼihi nʼetiti ọkọchị na udu mmiri nke afọ nʼabịa, eze Aram ga-abịa ibuso gị agha ọzọ.”

1 Kings 20:22 (UKJV) And the prophet came to the king of Israel, and said unto him, Go, strengthen yourself, and mark, and see what you do: for at the return of the year the king of Syria will come up against you.

20Onye ọbụla nʼime ha gburu onye agha Siria ọbụla lụsoro ya ọgụ. Nke a mere ka ndị agha Siria gbapụ ọsọ, ndị agha Izrel chụsokwara ha. Ma Ben-Hadad, eze Aram, na ndị agha na-agba ịnyịnya, sitekwara nʼihu ọgbọ agha ahụ gbapụkwa ọsọ.

21Ma eze ndị Izrel pụkwuru ya, nwude ọtụtụ ịnyịnya na ụgbọ agha, butere ndị Aram ọghọm dị ukwuu.

22Emesịa, onye amụma ahụ bịakwutere eze Izrel sị ya, “Mee onwe gị ka ị dị ike nke ọma, mara ihe e kwesiri ka e mee, nʼihi nʼetiti ọkọchị na udu mmiri nke afọ nʼabịa, eze Aram ga-abịa ibuso gị agha ọzọ.”

23Ma otu ọ dị, ndịisi agha eze ndị Aram dụrụ ya ọdụ sị, “Chi ha bụ chi ugwu. Nʼihi ya ka ha ji dị ike karịa anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ebuso ha agha nʼobosara ala dị larịị, anyị aghaghị ịdị ike karịa ha.

24Mee ihe a, wepụ ndị eze a niile site nʼebe ha nọ, jiri ndị na-achị ala gbanwee ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.