3‘Ọlaọcha na ọlaedo gị, nkem ka ha bụ, ndị nwunye gị na ụmụ gị, bụ ndị dị mma karịsịa nke m ka ha bụ.’ ”
4Ehab eze Izrel, zighachiri ozi sị, “Ọ dị mma, onyenwe m, mụ onwe m, na ihe niile m nwere bụ nke gị.”
5Ngwangwa ndị ozi Ben-Hadad bịaghachiri zie Ehab ozi ọzọ sị ya, “Otu a ka Ben-Hadad sịrị, ‘Ọ bụ ezie na m ziteere gị ozi, sị, ọlaọcha gị na ọlaedo gị na ndị nwunye gị na ụmụ gị ka ị ga-enye m.
6Ma ugbu a, nʼoge dị ka nke a, echi, aga m ezite ndị ozi m ka ha bịa nyochaa ụlọ gị niile na ụlọ ndị ozi gị niile. Ihe ọbụla dị oke ọnụahịa nʼanya gị ka ha ga-ewere.’ ”
7Eze Izrel kpọrọ ndị okenye niile nke ala ahụ, sị ha, “Leenụ ugbu a, hụkwanụ otu nwoke a si achọ nsogbu. Mgbe o zitere m ozi inye ya ndị nwunye m, na ụmụ, na ọlaọcha m na ọlaedo m, ekwenyere m ya inye ya ihe ndị a.”