1 Ndị Eze 20

Ma ugbu a, nʼoge dị ka nke a, echi, aga m ezite ndị ozi m ka ha bịa nyochaa ụlọ gị niile na ụlọ ndị ozi gị niile. Ihe ọbụla dị oke ọnụahịa nʼanya gị ka ha ga-ewere.’ ”

1 Kings 20:6 (UKJV) Yet I will send my servants unto you tomorrow about this time, and they shall search yours house, and the houses of your servants; and it shall be, that whatsoever is pleasant in yours eyes, they shall put it in their hand, and take it away.

4Ehab eze Izrel, zighachiri ozi sị, “Ọ dị mma, onyenwe m, mụ onwe m, na ihe niile m nwere bụ nke gị.”

5Ngwangwa ndị ozi Ben-Hadad bịaghachiri zie Ehab ozi ọzọ sị ya, “Otu a ka Ben-Hadad sịrị, ‘Ọ bụ ezie na m ziteere gị ozi, sị, ọlaọcha gị na ọlaedo gị na ndị nwunye gị na ụmụ gị ka ị ga-enye m.

6Ma ugbu a, nʼoge dị ka nke a, echi, aga m ezite ndị ozi m ka ha bịa nyochaa ụlọ gị niile na ụlọ ndị ozi gị niile. Ihe ọbụla dị oke ọnụahịa nʼanya gị ka ha ga-ewere.’ ”

7Eze Izrel kpọrọ ndị okenye niile nke ala ahụ, sị ha, “Leenụ ugbu a, hụkwanụ otu nwoke a si achọ nsogbu. Mgbe o zitere m ozi inye ya ndị nwunye m, na ụmụ, na ọlaọcha m na ọlaedo m, ekwenyere m ya inye ya ihe ndị a.”

8Ndị okenye na ndị Izrel zara sị ya, “Aṅala ya ntị! Enyela ya ihe ọbụla.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.