1 Ndị Eze 21

Ndị okenye na ndị a na-asọpụrụ ndị bi nʼobodo ahụ mere dịka Jezebel nyere nʼiwu nʼakwụkwọ ahụ o degaara ha.

1 Kings 21:11 (UKJV) And the men of his city, even the elders and the nobles who were the inhabitants in his city, did as Jezebel had sent unto them, and as it was written in the letters which she had sent unto them.

9Nʼime akwụkwọ ozi ndị a, o dere sị, “Nyenụ iwu ka mmadụ niile buo ọnụ. Kpọkọtaanụ ndị Jezril niile, ka ha zukọta. Mgbe unu zukọrọ, nyenụ Nebọt ọnọdụ nʼoche dị mkpa.

10Họpụtanụ ndị ikom abụọ, ndị na-abaghị uru ka ha pụta nʼihu nzukọ unu guzo gbaa ama ụgha megide Nebọt sị na ha nụrụ mgbe ọ kọchara Chineke na eze. Maanụ ya ikpe ọnwụ, kpụpụ ya nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya, ka ọ nwụọ.”

11Ndị okenye na ndị a na-asọpụrụ ndị bi nʼobodo ahụ mere dịka Jezebel nyere nʼiwu nʼakwụkwọ ahụ o degaara ha.

12Ha nyere iwu maka ibu ọnụ, kpọọkwa nzukọ ndị obodo ahụ niile, meekwa ka Nebọt nọdụ nʼoche dị mkpa.

13Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ na-abaghị uru pụtakwara, nọdụ na ncherita ihu ya, ha gbara ama ụgha megide Nebọt, nʼihu ndị mmadụ, sị, “Nebọt kọchara Chineke na eze.” Nʼihi nke a, ha dọkpụụrụ ya gaa nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.