1 Ndị Eze 21

Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ na-abaghị uru pụtakwara, nọdụ na ncherita ihu ya, ha gbara ama ụgha megide Nebọt, nʼihu ndị mmadụ, sị, “Nebọt kọchara Chineke na eze.” Nʼihi nke a, ha dọkpụụrụ ya gaa nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya.

1 Kings 21:13 (UKJV) And there came in two men, children of Belial, and sat before him: and the men of Belial witnessed against him, even against Naboth, in the presence of the people, saying, Naboth did blaspheme God and the king. Then they carried him forth out of the city, and stoned him with stones, that he died.

11Ndị okenye na ndị a na-asọpụrụ ndị bi nʼobodo ahụ mere dịka Jezebel nyere nʼiwu nʼakwụkwọ ahụ o degaara ha.

12Ha nyere iwu maka ibu ọnụ, kpọọkwa nzukọ ndị obodo ahụ niile, meekwa ka Nebọt nọdụ nʼoche dị mkpa.

13Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ na-abaghị uru pụtakwara, nọdụ na ncherita ihu ya, ha gbara ama ụgha megide Nebọt, nʼihu ndị mmadụ, sị, “Nebọt kọchara Chineke na eze.” Nʼihi nke a, ha dọkpụụrụ ya gaa nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya.

14Emesịa, ndị okenye na ndị a maara aha ha nke obodo Jezril, ziri ozi zigara Jezebel gwa ya na Nebọt anwụọla.

15Ngwangwa Jezebel natara ozi na a tụgbola Nebọt, ọ sịrị Ehab, “Bilie, gaa nwetara onwe gị ubi vaịnị Nebọt, nwoke onye Jezril. Ubi ahụ ọ jụrụ inye gị nʼego abụrụla nke gị ugbu a nʼihi na Nebọt anwụọla. Ọ dịkwaghị ndụ ọzọ!”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.