1 Ndị Eze 21

Mgbe Ehab nụrụ na Nebọt anwụọla, o biliri pụọ, gaa ịbanye nʼubi ahụ, inwetara onwe ya ubi vaịnị Nebọt, onye Jezril.

1 Kings 21:16 (UKJV) And it came to pass, when Ahab heard that Naboth was dead, that Ahab rose up to go down to the vineyard of Naboth the Jezreelite, to take possession of it.

14Emesịa, ndị okenye na ndị a maara aha ha nke obodo Jezril, ziri ozi zigara Jezebel gwa ya na Nebọt anwụọla.

15Ngwangwa Jezebel natara ozi na a tụgbola Nebọt, ọ sịrị Ehab, “Bilie, gaa nwetara onwe gị ubi vaịnị Nebọt, nwoke onye Jezril. Ubi ahụ ọ jụrụ inye gị nʼego abụrụla nke gị ugbu a nʼihi na Nebọt anwụọla. Ọ dịkwaghị ndụ ọzọ!”

16Mgbe Ehab nụrụ na Nebọt anwụọla, o biliri pụọ, gaa ịbanye nʼubi ahụ, inwetara onwe ya ubi vaịnị Nebọt, onye Jezril.

17Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe, sị ya,

18“Bilie, gaa zute Ehab, eze Izrel onye bi na Sameria. Ọ nọ ugbu a nʼime ubi vaịnị Nebọt inwetara ya onwe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.