1 Ndị Eze 21

“Bilie, gaa zute Ehab, eze Izrel onye bi na Sameria. Ọ nọ ugbu a nʼime ubi vaịnị Nebọt inwetara ya onwe ya.

1 Kings 21:18 (UKJV) Arise, go down to meet Ahab king of Israel, which is in Samaria: behold, he is in the vineyard of Naboth, where he is gone down to possess it.

16Mgbe Ehab nụrụ na Nebọt anwụọla, o biliri pụọ, gaa ịbanye nʼubi ahụ, inwetara onwe ya ubi vaịnị Nebọt, onye Jezril.

17Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe, sị ya,

18“Bilie, gaa zute Ehab, eze Izrel onye bi na Sameria. Ọ nọ ugbu a nʼime ubi vaịnị Nebọt inwetara ya onwe ya.

19Gwa ya sị ya, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: I gbuola ọchụ mmadụ si otu a nwetara onwe gị ihe nketa? Ebe ahụ nkịta nọ rachaa ọbara Nebọt ka ha ga-anọ rachaakwa ọbara gị. E, ọbara gị onwe gị.’ ”

20Mgbe ahụ, Ehab jụrụ Ịlaịja ajụjụ sị ya, “Onye iro m, ị chọrọkwala m bịa?” Ịlaịja zara sị ya, “E, achọrọla m gị bịa nʼihi nnyefe i nyefere onwe gị ime ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.