27Mgbe Ehab nụrụ okwu amụma ndị a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, buo ọnụ, dinaa nʼakwa mkpe ahụ, jegharịakwa nʼịdị umeala.
28Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe ọzọ, sị ya,
29“Ị hụrụ otu Ehab si weda onwe ya ala nʼihu m? Nʼihi ihe a o mere, iweda onwe ya ala nʼihu m, agaghị m eme ka ihe ọjọọ ndị a m kwuru okwu banyere ha rute ya nʼoge ọ dị ndụ. Kama aga m eme ka ihe ndị a dakwasị ezinaụlọ ya mgbe nwa ya ga-achị dịka eze.”