50Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid, nna ya. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
51Ahazaya nwa Ehab, malitere ịbụ eze Izrel na Sameria, nʼafọ iri na asaa nke ọchịchị Jehoshafat, eze Juda. Ma ọ chịrị Izrel naanị afọ abụọ.
52O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na o sooro ụzọ ọjọọ niile nke nna na nne ya, na ụzọ ọjọọ nke Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel mee mmehie.
53Ọ fekwara arụsị Baal ofufe, kpọọkwa isiala nye ya, si otu a kpasuo Onyenwe anyị, Chineke Izrel iwe, dịka nna ya mere.