1 Ndị Eze 3

Nʼisi ụtụtụ, mgbe m tetara nʼụra chọọ inye nwa m ara, achọpụtara m na ọ nwụọla. Ma mgbe m leziri ya anya nke ọma ka chi bọrọ, ahụrụ m na nwa mụ na ya dina abụghị nwa nke m mụrụ.”

1 Kings 3:21 (UKJV) And when I rose in the morning to give my child suck, behold, it was dead: but when I had considered it in the morning, behold, it was not my son, which I did bear.

19“Ma nʼotu abalị, nwa ya nwụrụ mgbe o dinakwasịrị ya nʼoge ọ na-arahụ ụra.

20Mgbe o biliri nʼetiti abalị, chọpụtara na nwa ya anwụọla, o kuuru ya nibe ya nʼakụkụ m, kurukwanụ nwa nke m dị ndụ nibe nʼakụkụ ya onwe ya.

21Nʼisi ụtụtụ, mgbe m tetara nʼụra chọọ inye nwa m ara, achọpụtara m na ọ nwụọla. Ma mgbe m leziri ya anya nke ọma ka chi bọrọ, ahụrụ m na nwa mụ na ya dina abụghị nwa nke m mụrụ.”

22Mgbe ahụ, nwanyị nke ọzọ kwuru sị, “Mba, nwantakịrị ahụ dị ndụ bụ nwa m, ma nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị.” Nwanyị nke mbụ zara sị, “Mba, ọ bụghị eziokwu; nwa nke nwụrụ anwụ bụ nke gị, ma nke dị ndụ bụ nke m.” Otu a ka ha si na-arụrịta ụka nʼihu eze.

23Eze kwuru sị, “Onye nke a na-asị, ‘Nwa m bụ nke dị ndụ, ma nke gị bụ nke nwụrụ anwụ,’ mgbe onye nke ọzọ na-asị, ‘Mba! Nwa gị bụ nke nwụrụ anwụ, ma nke m bụ nke dị ndụ.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.