1 Ndị Eze 3

Mgbe o biliri nʼetiti abalị, chọpụtara na nwa ya anwụọla, o kuuru ya nibe ya nʼakụkụ m, kurukwanụ nwa nke m dị ndụ nibe nʼakụkụ ya onwe ya.

1 Kings 3:20 (UKJV) And she arose at midnight, and took my son from beside me, while yours handmaid slept, and laid it in her bosom, and laid her dead child in my bosom.

18Mgbe ụbọchị atọ gasịrị ka m mụsịrị nwa, ya onwe ya mụkwara nwa nke ya. Naanị anyị abụọ bi, o nweghị onye ọzọ binyere anyị.

19“Ma nʼotu abalị, nwa ya nwụrụ mgbe o dinakwasịrị ya nʼoge ọ na-arahụ ụra.

20Mgbe o biliri nʼetiti abalị, chọpụtara na nwa ya anwụọla, o kuuru ya nibe ya nʼakụkụ m, kurukwanụ nwa nke m dị ndụ nibe nʼakụkụ ya onwe ya.

21Nʼisi ụtụtụ, mgbe m tetara nʼụra chọọ inye nwa m ara, achọpụtara m na ọ nwụọla. Ma mgbe m leziri ya anya nke ọma ka chi bọrọ, ahụrụ m na nwa mụ na ya dina abụghị nwa nke m mụrụ.”

22Mgbe ahụ, nwanyị nke ọzọ kwuru sị, “Mba, nwantakịrị ahụ dị ndụ bụ nwa m, ma nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị.” Nwanyị nke mbụ zara sị, “Mba, ọ bụghị eziokwu; nwa nke nwụrụ anwụ bụ nke gị, ma nke dị ndụ bụ nke m.” Otu a ka ha si na-arụrịta ụka nʼihu eze.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.