1 Ndị Eze 3

Mgbe ụbọchị atọ gasịrị ka m mụsịrị nwa, ya onwe ya mụkwara nwa nke ya. Naanị anyị abụọ bi, o nweghị onye ọzọ binyere anyị.

1 Kings 3:18 (UKJV) And it came to pass the third day after that I was delivered, that this woman was delivered also: and we were together; there was no stranger with us in the house, save we two in the house.

16Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ nwanyị akwụna abụọ bịakwutere eze, guzo nʼihu ya.

17Otu nʼime ha gwara ya sị, “Onyenwe m, mụ na nwanyị a bi nʼotu ụlọ. Anyị abụọ dịkwa ime. Ma eburu m ya ụzọ mụọ nwa nke m.

18Mgbe ụbọchị atọ gasịrị ka m mụsịrị nwa, ya onwe ya mụkwara nwa nke ya. Naanị anyị abụọ bi, o nweghị onye ọzọ binyere anyị.

19“Ma nʼotu abalị, nwa ya nwụrụ mgbe o dinakwasịrị ya nʼoge ọ na-arahụ ụra.

20Mgbe o biliri nʼetiti abalị, chọpụtara na nwa ya anwụọla, o kuuru ya nibe ya nʼakụkụ m, kurukwanụ nwa nke m dị ndụ nibe nʼakụkụ ya onwe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.