15Mgbe ahụ, Solomọn si nʼụra teta, ghọtakwa na ọ bụ nrọ ka ọ na-arọ. Ọ lọtara na Jerusalem bata guzo nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, chụọ aja nsure ọkụ na aja udo. Emesịa, o meere ndị na-ejere ya ozi oke oriri.
16Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ nwanyị akwụna abụọ bịakwutere eze, guzo nʼihu ya.
17Otu nʼime ha gwara ya sị, “Onyenwe m, mụ na nwanyị a bi nʼotu ụlọ. Anyị abụọ dịkwa ime. Ma eburu m ya ụzọ mụọ nwa nke m.
18Mgbe ụbọchị atọ gasịrị ka m mụsịrị nwa, ya onwe ya mụkwara nwa nke ya. Naanị anyị abụọ bi, o nweghị onye ọzọ binyere anyị.
19“Ma nʼotu abalị, nwa ya nwụrụ mgbe o dinakwasịrị ya nʼoge ọ na-arahụ ụra.