11Solomọn nyere Hiram na ezinaụlọ ya narị puku bushel, na iri puku bushel ọka wiiti abụọ, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ ya, tinyekwara narị puku galọọnụ, na iri puku galọọnụ abụọ nke mmanụ oliv asụrụ asụ. Solomọn nọgidere na-enye Hiram ihe ndị a kwa afọ.
12Onyenwe anyị nyere Solomọn amamihe dị ukwuu dịka o kwere ya na nkwa. Hiram na Solomọn nwere mmekọ udo, ha abụọ gbakwara ndụ.
13Eze Solomọn, sitere nʼakụkụ Izrel niile kpọbata ndị ọrụ mmanye ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ.
14Nʼotu ọnwa, ọ na-eziga puku mmadụ iri nʼime ndị a ka ha gaa Lebanọn ịrụ ọrụ. Nʼọnwa ọzọ, ọ na-ezigakwa puku mmadụ iri ka ha gaa gbanwee ndị buuru ụzọ gaa. Nʼụzọ dị otu a, otu ụzọ nʼime iri puku mmadụ atọ ndị a na-anọ na Lebanọn otu ọnwa maka ịrụ ọrụ, ma ha na-alọta zuo ike ọnwa abụọ. Adoniram bụ onyeisi ndị ọrụ mmanye a.
15Solomọn nwere ndị ọrụ ọzọ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa na-ebu ibu, nweekwa ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ.