13Eze Solomọn, sitere nʼakụkụ Izrel niile kpọbata ndị ọrụ mmanye ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ.
14Nʼotu ọnwa, ọ na-eziga puku mmadụ iri nʼime ndị a ka ha gaa Lebanọn ịrụ ọrụ. Nʼọnwa ọzọ, ọ na-ezigakwa puku mmadụ iri ka ha gaa gbanwee ndị buuru ụzọ gaa. Nʼụzọ dị otu a, otu ụzọ nʼime iri puku mmadụ atọ ndị a na-anọ na Lebanọn otu ọnwa maka ịrụ ọrụ, ma ha na-alọta zuo ike ọnwa abụọ. Adoniram bụ onyeisi ndị ọrụ mmanye a.
15Solomọn nwere ndị ọrụ ọzọ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa na-ebu ibu, nweekwa ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ.
16Nʼagụnyeghị ndị a, o nwekwara ndịisi, ndị na-elekọta ndị ọrụ ndị a, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị atọ.
17Dịka iwu eze si dị, ha na-esite nʼebe a na-awa nkume ebupụta nkume dị mma buru ibu nke e ji ewu ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ