1 Ndị Eze 5

Dịka iwu eze si dị, ha na-esite nʼebe a na-awa nkume ebupụta nkume dị mma buru ibu nke e ji ewu ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ

1 Kings 5:17 (UKJV) And the king commanded, and they brought great stones, costly stones, and hewed stones, to lay the foundation of the house.

15Solomọn nwere ndị ọrụ ọzọ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa na-ebu ibu, nweekwa ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ.

16Nʼagụnyeghị ndị a, o nwekwara ndịisi, ndị na-elekọta ndị ọrụ ndị a, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị atọ.

17Dịka iwu eze si dị, ha na-esite nʼebe a na-awa nkume ebupụta nkume dị mma buru ibu nke e ji ewu ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ

18Ndị ikom si Gebal, nyere ndị ọrụ Solomọn na ndị ọrụ Hiram aka, igbutu osisi na ịwa ha. Ha nyekwara aka ịkwado nkume e ji ewu ụlọ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.