1 Ndị Eze 6

O ji osisi oliv mee ibo ọnụ ụzọ mbata nke ime ime ebe nsọ ahụ, osisi ndị a bụ otu ụzọ nʼụzọ ise nke obosara ebe nsọ ahụ.

1 Kings 6:31 (UKJV) And for the entering of the oracle he made doors of olive tree: the lintel and side posts were a fifth part of the wall.

29Nʼahụ aja ụlọnsọ ukwu ahụ gbaa gburugburu, ma nʼime ọnụụlọ nke dị nʼime na ndị dị na mpụta, ka ọ pịkwasịrị oyiyi cherubim, osisi nkwụ na okoko osisi wara awa.

30O jikwa ọlaedo machie ala ụlọ nke ọnụụlọ niile dị nʼime ụlọ, na ọnụụlọ ndị dị na mpụta ụlọnsọ ukwu ahụ.

31O ji osisi oliv mee ibo ọnụ ụzọ mbata nke ime ime ebe nsọ ahụ, osisi ndị a bụ otu ụzọ nʼụzọ ise nke obosara ebe nsọ ahụ.

32Nʼahụ ibo abụọ ahụ nke si nʼosisi oliv, ọ tụnyere oyiyi cherubim abụọ, igu nkwụ na okoko osisi wara awa. O ji ọlaedo etipịara etipịa machie oyiyi cherubim na igu nkwụ ndị ahụ.

33Otu a kwa, o ji osisi oliv mee mbudo ibo ọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ ezumezu ahụ, nke bụ otu ụzọ na nkewa anọ nke obosara ụlọ ezumezu ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.