1 Ndị Eze 6

Otu a kwa, o ji osisi oliv mee mbudo ibo ọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ ezumezu ahụ, nke bụ otu ụzọ na nkewa anọ nke obosara ụlọ ezumezu ahụ.

1 Kings 6:33 (UKJV) So also made he for the door of the temple posts of olive tree, a fourth part of the wall.

31O ji osisi oliv mee ibo ọnụ ụzọ mbata nke ime ime ebe nsọ ahụ, osisi ndị a bụ otu ụzọ nʼụzọ ise nke obosara ebe nsọ ahụ.

32Nʼahụ ibo abụọ ahụ nke si nʼosisi oliv, ọ tụnyere oyiyi cherubim abụọ, igu nkwụ na okoko osisi wara awa. O ji ọlaedo etipịara etipịa machie oyiyi cherubim na igu nkwụ ndị ahụ.

33Otu a kwa, o ji osisi oliv mee mbudo ibo ọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ ezumezu ahụ, nke bụ otu ụzọ na nkewa anọ nke obosara ụlọ ezumezu ahụ.

34O jikwa osisi junipa mee ibo abụọ a na-emechikọta nʼotu.

35Ọ pịrị oyiyi cherubim na oyiyi nkwụ, na oyiyi okoko osisi wara awa, jiri ọlaedo techie ibo ndị ahụ na oyiyi a pịkwasịrị ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.