1 Ndị Eze 6

O jikwa osisi junipa mee ibo abụọ a na-emechikọta nʼotu.

1 Kings 6:34 (UKJV) And the two doors were of fir tree: the two leaves of the one door were folding, and the two leaves of the other door were folding.

32Nʼahụ ibo abụọ ahụ nke si nʼosisi oliv, ọ tụnyere oyiyi cherubim abụọ, igu nkwụ na okoko osisi wara awa. O ji ọlaedo etipịara etipịa machie oyiyi cherubim na igu nkwụ ndị ahụ.

33Otu a kwa, o ji osisi oliv mee mbudo ibo ọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ ezumezu ahụ, nke bụ otu ụzọ na nkewa anọ nke obosara ụlọ ezumezu ahụ.

34O jikwa osisi junipa mee ibo abụọ a na-emechikọta nʼotu.

35Ọ pịrị oyiyi cherubim na oyiyi nkwụ, na oyiyi okoko osisi wara awa, jiri ọlaedo techie ibo ndị ahụ na oyiyi a pịkwasịrị ha.

36O wuru ogige nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ bụ ahịrị nkume atọ e doziri edozi na otu ahịrị osisi sida a kwachara nke ọma ka e ji wuo ogige a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.