34O jikwa osisi junipa mee ibo abụọ a na-emechikọta nʼotu.
35Ọ pịrị oyiyi cherubim na oyiyi nkwụ, na oyiyi okoko osisi wara awa, jiri ọlaedo techie ibo ndị ahụ na oyiyi a pịkwasịrị ha.
36O wuru ogige nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ bụ ahịrị nkume atọ e doziri edozi na otu ahịrị osisi sida a kwachara nke ọma ka e ji wuo ogige a.
37Ọ bụ nʼọnwa Ziv, nʼafọ nke anọ, nke ịbụ eze Solomọn ka a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
38Ọ bụ nʼime afọ iri na otu, nʼọnwa Bul, ya bụ ọnwa nke asatọ, ka e wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼihe niile ya dịka ntụziaka e nyere si dị. Ọ bụ afọ asaa ka o weere ya i ji rụchaa ụlọnsọ ukwu ahụ.