33Otu a kwa, o ji osisi oliv mee mbudo ibo ọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ ezumezu ahụ, nke bụ otu ụzọ na nkewa anọ nke obosara ụlọ ezumezu ahụ.
34O jikwa osisi junipa mee ibo abụọ a na-emechikọta nʼotu.
35Ọ pịrị oyiyi cherubim na oyiyi nkwụ, na oyiyi okoko osisi wara awa, jiri ọlaedo techie ibo ndị ahụ na oyiyi a pịkwasịrị ha.
36O wuru ogige nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ bụ ahịrị nkume atọ e doziri edozi na otu ahịrị osisi sida a kwachara nke ọma ka e ji wuo ogige a.
37Ọ bụ nʼọnwa Ziv, nʼafọ nke anọ, nke ịbụ eze Solomọn ka a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.