1 Ndị Eze 7

Ọ kpụrụ ogidi bronz abụọ, nke ọtụtụ ya ruru mita asatọ na otu ụma nʼogologo, na mita ise na ụma anọ gburugburu ya.

1 Kings 7:15 (UKJV) For he cast two pillars of brass, of eighteen cubits high apiece: and a line of twelve cubits did compass either of them about.

13Eze Solomọn zigara ozi na Taịa, ka a kpọta Huram.

14Nne Huram bụ nwanyị si nʼebo Naftalị nke di ya nwụrụ anwụ, ma nna ya bụ onye Taịa, onye maara ǹka dị nʼịkpụ bronz. Huram jupụtara nʼamamihe na nghọta nʼihe ọmụma ịrụ ọrụ ọbụla metụtara bronz. Ọ bịakwutere eze bụ Solomọn, rụọkwa ọrụ niile enyere ya ịrụ.

15Ọ kpụrụ ogidi bronz abụọ, nke ọtụtụ ya ruru mita asatọ na otu ụma nʼogologo, na mita ise na ụma anọ gburugburu ya.

16Ọ kpụkwara ihe ọkpụkpụ bronz, nke isi ya yiri ọnụ ite mmiri. A dọkwasịrị ha nʼelu ogidi ọla abụọ ahụ. Otu nʼime ihe ọkpụkpụ bronz abụọ ndị a dị ihe ruru mita abụọ na ụma atọ nʼogologo.

17E nwekwara ihe e ji chọọ ha mma. Ọ bụ ọla akpara akpa, nke yiri ụdọ a tụrụ atụ ka e ji chọọ ha mma. Asaa dị nʼotu ihe ọkpụkpụ ọla.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.