1 Ndị Eze 7

E nwekwara ihe e ji chọọ ha mma. Ọ bụ ọla akpara akpa, nke yiri ụdọ a tụrụ atụ ka e ji chọọ ha mma. Asaa dị nʼotu ihe ọkpụkpụ ọla.

1 Kings 7:17 (UKJV) And nets of checker work, and wreaths of chain work, for the capitals which were upon the top of the pillars; seven for the one capital, and seven for the other capital.

15Ọ kpụrụ ogidi bronz abụọ, nke ọtụtụ ya ruru mita asatọ na otu ụma nʼogologo, na mita ise na ụma anọ gburugburu ya.

16Ọ kpụkwara ihe ọkpụkpụ bronz, nke isi ya yiri ọnụ ite mmiri. A dọkwasịrị ha nʼelu ogidi ọla abụọ ahụ. Otu nʼime ihe ọkpụkpụ bronz abụọ ndị a dị ihe ruru mita abụọ na ụma atọ nʼogologo.

17E nwekwara ihe e ji chọọ ha mma. Ọ bụ ọla akpara akpa, nke yiri ụdọ a tụrụ atụ ka e ji chọọ ha mma. Asaa dị nʼotu ihe ọkpụkpụ ọla.

18Ọ kpụrụ ihe yiri mkpụrụ pomegranet, nke dị nʼahịrị abụọ, nke o ji gbaa ihe ịchọ mma ndị ahụ gburugburu, maka iji ha chọọ ihe ọkpụkpụ ọla ndị ahụ dị nʼelu ogidi ndị ahụ mma. O mere otu ihe a maka ihe ọkpụkpụ ọla ọbụla.

19Ihe ọkpụkpụ ọla ndị dị nʼelu ogidi dị na mgbe ụlọ ka o mere ka ha yie okoko osisi lili. Ịdị elu ha ruru otu mita na ụma asatọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.