1 Ndị Eze 7

O wuru ụlọeze ukwu aha ya bụ Oke Ọhịa Lebanọn, nke ogologo ya dị iri mita ise, obosara ya dị iri mita abụọ na ise. Otu a kwa, ịdị elu ya dị mita iri na ise. Osisi sida ukwu e ji rụọ elu ya ka e mere ka ha nọkwasị nʼelu ogidi e doro nʼahịrị nʼahịrị. Ahịrị ogidi ndị a dịkwa anọ.

1 Kings 7:2 (UKJV) He built also the house of the forest of Lebanon; the length thereof was an hundred cubits, and the breadth thereof fifty cubits, and the height thereof thirty cubits, upon four rows of cedar pillars, with cedar beams upon the pillars.

1Solomọn ji afọ iri na atọ wuo ụlọ nke ya, bịa ruchakwaa ụlọ ya niile.

2O wuru ụlọeze ukwu aha ya bụ Oke Ọhịa Lebanọn, nke ogologo ya dị iri mita ise, obosara ya dị iri mita abụọ na ise. Otu a kwa, ịdị elu ya dị mita iri na ise. Osisi sida ukwu e ji rụọ elu ya ka e mere ka ha nọkwasị nʼelu ogidi e doro nʼahịrị nʼahịrị. Ahịrị ogidi ndị a dịkwa anọ.

3Ọ bụkwa osisi sida ka e ji machie elu ụlọ ahụ. A kụkwasịrị osisi ndị a nʼelu osisi sida ukwu ndị a a wara awa, ndị e mere ka ha nọkwasị nʼogidi ndị ahụ. Ọnụọgụgụ osisi ndị ahụ bụ iri anọ na ise. Ọ bụkwa iri na ise ka e nwere nʼahịrị ọbụla.

4Oghereikuku ya dịkwa nʼụzọ ahịrị atọ, otu nʼelu ibe ya. E mere ka oghereikuku ndị dị nʼelu nʼotu akụkụ chee oghereikuku ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ ihu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.