1 Ndị Eze 7

Ihe ndọkwasị ahụ nwere ihe e ji jikọta ya dị nʼetiti ya. Otu a ka e si mee ihe ndọkwasị ahụ.

1 Kings 7:28 (UKJV) And the work of the bases was on this manner: they had borders, and the borders were between the ledges:

26Ịdị arọ ya ha ka otu ọtụtụ ntu-aka dimkpa. E mere ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko mmiri, dịkwa ka okoko lili na-awapụta awapụta. Ọ na-erite puku galọọnụ iri na abụọ.

27O mekwara ihe ndọkwasị bronz iri, nke e nwere ike ịkpụgharị akpụgharị. Mita abụọ ka ogologo nke otu ihe ndọkwasị ọbụla dị, mita abụọ ka obosara ya dịkwa; ịdị elu ya dị otu mita na ọkara.

28Ihe ndọkwasị ahụ nwere ihe e ji jikọta ya dị nʼetiti ya. Otu a ka e si mee ihe ndọkwasị ahụ.

29Nʼelu ihe njikọta ahụ ka a wụrụ oyiyi dị iche iche, dịka ọdụm, na oke ehi, na ndị mmụọ ozi cherubim nwere nku. Nʼelu, na nʼokpuru ọdụm, na oke ehi ndị ahụ, a wụkwara ahịhịa na okoko osisi dị iche iche.

30Otu ihe ndọkwasị ọbụla nwere ụkwụ bronz anọ dị gburugburu, nweekwa okporo bronz ebe ụkwụ ndị a na-agbagharị. Nʼakụkụ anọ nke ihe ndọkwasị ndị a, a rụnyere ebe a na-adọkwasị efere. E ji oyiyi okoko osisi na ahịhịa chọọ ihe ndị a mma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.