33E mekwara ụkwụ ndị a dịka ụkwụ ụgbọala nke ịnyịnya na-adọkpụ. Ọ bụkwa ọla ka e ji kpụọ akụkụ ihe ndọkwasị ahụ niile, ma okporo igwe ukwu, ma okporo igwe nta, na ihe niile jikọtara ha.
34Ụkwụ ọla nta anọ dịkwa nʼokpuru ihe ndọkwasị ahụ, nʼakụkụ ọbụla. A wụkọtakwara ha na ihe ndọkwasị ahụ.
35E nwere ihe a magidere gburugburu nʼelu ihe ndọkwasị ọbụla, nke omimi ya dị iri sentimita abụọ na ụma atọ. Ọla a, na ụkwụ ya, ka a wụkọtara na ihe ndọkwasị ahụ otu mgbe.
36Ebe ọbụla ohere dị, o gbunyere oyiyi cherubim nwere nku, na oyiyi ọdụm, na oyiyi osisi nkwụ, nʼahụ ibo ọla ahụ e mere ka ọ dịrị gburugburu elu ihe ndọkwasị ọla ahụ.
37Ihe ndọkwasị ọla iri ndị ahụ ha otu. Ha yikwara ibe ha, nʼihi na e mere ka ha nwee otu ụdị.