1 Ndị Eze 7

Ụkwụ ọla nta anọ dịkwa nʼokpuru ihe ndọkwasị ahụ, nʼakụkụ ọbụla. A wụkọtakwara ha na ihe ndọkwasị ahụ.

1 Kings 7:34 (UKJV) And there were four supporters to the four corners of one base: and the supporters were of the very base itself.

32A na-adọkpụgharị ihe ndọkwasị a nʼụkwụ anọ o nwere. A dụnyekọtakwara ụkwụ anọ ndị a nʼime okporo ọla e mekọtara ya na ihe ndọkwasị ahụ. Ịdị elu nke ụkwụ ọbụla bụ iri sentimita isii na asatọ.

33E mekwara ụkwụ ndị a dịka ụkwụ ụgbọala nke ịnyịnya na-adọkpụ. Ọ bụkwa ọla ka e ji kpụọ akụkụ ihe ndọkwasị ahụ niile, ma okporo igwe ukwu, ma okporo igwe nta, na ihe niile jikọtara ha.

34Ụkwụ ọla nta anọ dịkwa nʼokpuru ihe ndọkwasị ahụ, nʼakụkụ ọbụla. A wụkọtakwara ha na ihe ndọkwasị ahụ.

35E nwere ihe a magidere gburugburu nʼelu ihe ndọkwasị ọbụla, nke omimi ya dị iri sentimita abụọ na ụma atọ. Ọla a, na ụkwụ ya, ka a wụkọtara na ihe ndọkwasị ahụ otu mgbe.

36Ebe ọbụla ohere dị, o gbunyere oyiyi cherubim nwere nku, na oyiyi ọdụm, na oyiyi osisi nkwụ, nʼahụ ibo ọla ahụ e mere ka ọ dịrị gburugburu elu ihe ndọkwasị ọla ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.