45ite niile, shọvel niile na efere ịkwọsa mmiri. Ihe ndị a niile nke Huram meere eze Solomọn nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ bronz na-egbu maramara ka eji mee ha.
46Ọ bụ nʼala ụrọ, nʼobosara ala Jọdan, nʼetiti Sukọt na Zaretan ka eze mere ka a nọrọ kpụọ ihe ndị a.
47Ma Solomọn atụghị ihe ndị a niile a kpụrụ nʼihe ọtụtụ, nʼihi na ha dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ, achọpụtaghịkwa ịdị arọ nke bronz ahụ.
48Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, ya bụ: ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, tebul ọlaedo nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị.
49E jikwa ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna, ise nʼakụkụ aka nri, ise nʼakụkụ aka ekpe, nʼihu ime ime ebe nsọ; tinyere ihe ịchọ mma oyiyi okoko osisi, na oriọna niile, na ihe ịgụta ihe niile;