48Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, ya bụ: ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, tebul ọlaedo nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị.
49E jikwa ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna, ise nʼakụkụ aka nri, ise nʼakụkụ aka ekpe, nʼihu ime ime ebe nsọ; tinyere ihe ịchọ mma oyiyi okoko osisi, na oriọna niile, na ihe ịgụta ihe niile;
50na efere ọlaedo a nụchara anụcha dị iche iche, na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri, na ngaji na ihe ịgụ ọkụ; na ihe ikonye ibo nʼihi ibo ọnụụlọ ndị dị nʼime ime, bụ Ebe Kachasị Nsọ, nakwa ibo ndị dị nʼọnụ ụzọ ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ukwu.
51Mgbe a rụzuru ọrụ niile nke eze Solomọn nwere ịrụ maka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, o webatara ihe niile Devid bụ nna ya doro nsọ nʼime ya, ya bụ ọlaọcha, ọlaedo na ngwongwo ndị ọzọ niile. O tinyere ha nʼụlọakụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.