1 Ndị Eze 7

O wuru ọnụ ụzọ mbata nke ogidi, nke ruru iri mita na anọ nʼobosara, rukwaa iri mita anọ na ise nʼịdị ogologo. Nʼihu ya, e nwere mpụta ọnụ ụlọ, nʼihu ya, e nwekwara ogidi na elu ebe kpuchiri ekpuchi.

1 Kings 7:6 (UKJV) And he made a porch of pillars; the length thereof was fifty cubits, and the breadth thereof thirty cubits: and the porch was before them: and the other pillars and the thick beam were before them.

4Oghereikuku ya dịkwa nʼụzọ ahịrị atọ, otu nʼelu ibe ya. E mere ka oghereikuku ndị dị nʼelu nʼotu akụkụ chee oghereikuku ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ ihu.

5Ọnụ ụzọ niile nwere mbudo ọnụ ụzọ anọ. Ha dị atọ atọ cherịtara ibe ha ihu nʼebe mpụta ya.

6O wuru ọnụ ụzọ mbata nke ogidi, nke ruru iri mita na anọ nʼobosara, rukwaa iri mita anọ na ise nʼịdị ogologo. Nʼihu ya, e nwere mpụta ọnụ ụlọ, nʼihu ya, e nwekwara ogidi na elu ebe kpuchiri ekpuchi.

7E nwekwara ọnụ ụlọ ọzọ a na-akpọ, Ụlọ Ocheeze, maọbụ Ụlọ Ikpe ziri ezi ebe Solomọn na-anọ ekpe ikpe. E ji osisi sida machie ahụ ya niile, site nʼala ruo nʼelu.

8Ụlọ obibi Solomọn dịkwa nʼogige dị nʼazụ ụlọ ikpe a. E wukwara ya dịka e si wuo ụlọ ndị ọzọ. Solomọn wukwaara nwunye ya ụlọ yiri nke ya. Nwanyị a bụ nwa Fero, eze ndị Ijipt, nke Solomọn na-alụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.