24I mezuokwala nkwa niile i kwere nna m Devid, bụ ohu gị. I ji ọnụ gị kwee nkwa a ma taa, i jirila aka gị mezuo ya.
25“Ugbu a, O! Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, mezukwaa nkwa niile i kwere Devid nna m, mgbe ị sịrị, ‘Ọ bụrụ na ụmụ ụmụ gị elezie anya bie ndụ nʼụzọ kwesiri ntụkwasị obi nʼihu m, nʼihe niile ha na-eme, dịka gị onwe gị mere, agaghị achọ onye ga-anọ nʼihu m nʼocheeze Izrel nʼime ha.’
26Ma ugbu a, Chineke nke Izrel, ka okwu gị, bụ nkwa nke i kwere ohu gị, bụ nna m Devid, bịa na mmezu.
27“Ma ọ bụ ezie na gị Chineke ga-ebi nʼelu ụwa? Lee, eluigwe ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị?
28Ma Onyenwe anyị Chineke m, ṅaa ntị nʼekpere ohu gị, na arịrịọ ọ na-arịọ maka ebere. Nụrụ akwa na ekpere nke ohu gị na-ekpe nʼihu gị taa.