23kwuo sị, “Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe nke dị nʼelu, maọbụ nʼụwa, nʼokpuru eluigwe. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị.
24I mezuokwala nkwa niile i kwere nna m Devid, bụ ohu gị. I ji ọnụ gị kwee nkwa a ma taa, i jirila aka gị mezuo ya.
25“Ugbu a, O! Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, mezukwaa nkwa niile i kwere Devid nna m, mgbe ị sịrị, ‘Ọ bụrụ na ụmụ ụmụ gị elezie anya bie ndụ nʼụzọ kwesiri ntụkwasị obi nʼihu m, nʼihe niile ha na-eme, dịka gị onwe gị mere, agaghị achọ onye ga-anọ nʼihu m nʼocheeze Izrel nʼime ha.’
26Ma ugbu a, Chineke nke Izrel, ka okwu gị, bụ nkwa nke i kwere ohu gị, bụ nna m Devid, bịa na mmezu.
27“Ma ọ bụ ezie na gị Chineke ga-ebi nʼelu ụwa? Lee, eluigwe ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị?