27“Ma ọ bụ ezie na gị Chineke ga-ebi nʼelu ụwa? Lee, eluigwe ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị?
28Ma Onyenwe anyị Chineke m, ṅaa ntị nʼekpere ohu gị, na arịrịọ ọ na-arịọ maka ebere. Nụrụ akwa na ekpere nke ohu gị na-ekpe nʼihu gị taa.
29Biko, mee ka anya gị abụọ ghere oghe nʼebe ụlọnsọ ukwu a dị, abalị na ehihie, bụ ebe a i kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adị nʼebe ahụ,’ ka i si otu a nụrụ ekpere nke ohu gị ga-ekpe banyere ebe a.
30Nụrụkwa arịrịọ ohu gị na nke ndị gị Izrel niile, mgbe ọbụla ha chere ihu ha nʼebe a nʼekpere. Biko, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ, mgbe ị nụrụ biko, gbagharakwa.
31“Mgbe onye ọbụla mehiere mmadụ ibe ya, a kpọọ ya oku ka ọ bịa ṅụọ iyi, onye dị otu a bịa, guzo nʼebe a, nʼihu ebe ịchụ aja gị a, ṅụọ iyi ahụ.