1 Ndị Eze 8

“Mgbe onye ọbụla mehiere mmadụ ibe ya, a kpọọ ya oku ka ọ bịa ṅụọ iyi, onye dị otu a bịa, guzo nʼebe a, nʼihu ebe ịchụ aja gị a, ṅụọ iyi ahụ.

1 Kings 8:31 (UKJV) If any man trespass against his neighbour, and an oath be laid upon him to cause him to swear, and the oath come before yours altar in this house:

29Biko, mee ka anya gị abụọ ghere oghe nʼebe ụlọnsọ ukwu a dị, abalị na ehihie, bụ ebe a i kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adị nʼebe ahụ,’ ka i si otu a nụrụ ekpere nke ohu gị ga-ekpe banyere ebe a.

30Nụrụkwa arịrịọ ohu gị na nke ndị gị Izrel niile, mgbe ọbụla ha chere ihu ha nʼebe a nʼekpere. Biko, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ, mgbe ị nụrụ biko, gbagharakwa.

31“Mgbe onye ọbụla mehiere mmadụ ibe ya, a kpọọ ya oku ka ọ bịa ṅụọ iyi, onye dị otu a bịa, guzo nʼebe a, nʼihu ebe ịchụ aja gị a, ṅụọ iyi ahụ.

32Mgbe ahụ, nụrụ olu ya nʼeluigwe ma mee ihe ziri ezi. Kpeekwa ikpe nʼetiti ndị ohu gị, maa onye mejọrọ ikpe site nʼịtụkwasị nʼisi ha ihe o metara, meekwa ka onye aka ya dị ọcha nwere onwe ya, site nʼimeso ha dịka ezi omume ha si dị.

33“Mgbe ndị iro meriri ndị gị Izrel, nʼihi na ha mehiere megide gị, ọ bụrụ na ha alọghachikwute gị, too aha gị, na-ekpe ekpere, na-arịọ gị arịrịọ nʼụlọnsọ ukwu a,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.