1 Ndị Eze 8

nʼihi na ha ga-anụ ihe banyere aha ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a,

1 Kings 8:42 (UKJV) (For they shall hear of your great name, and of your strong hand, and of your stretched out arm;) when he shall come and pray toward this house;

40ka ha tụọ egwu gị oge niile nke ha na-ebi nʼala ahụ nke i nyere nna nna anyị ha.

41“Ma banyere onye mba ọzọ, onye na-esonyeghị na ndị gị Izrel, kama o si nʼala ebe dị anya bịa nʼihi Aha gị,

42nʼihi na ha ga-anụ ihe banyere aha ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a,

43mgbe ahụ, site nʼeluigwe ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Mekwaa ihe niile nke onye mba ọzọ ahụ na-arịọ nʼekpere, ka ndị niile nke ụwa mara aha gị, tụọkwa egwu gị, dịka ndị nke gị bụ Izrel na-eme, ka ha matakwa na-akpọkwasịrị Aha gị nʼụlọ a nke m wuru.

44“Mgbe ndị gị ga-aga ibu agha megide ndị iro ha, nʼebe ọbụla ị na-eziga ha, mgbe ha chere ihu ha nʼụzọ obodo a nke ị họpụtara na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị, kpee ekpere nye Onyenwe anyị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.