1 Ndị Eze 8

“Mgbe ndị gị ga-aga ibu agha megide ndị iro ha, nʼebe ọbụla ị na-eziga ha, mgbe ha chere ihu ha nʼụzọ obodo a nke ị họpụtara na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị, kpee ekpere nye Onyenwe anyị,

1 Kings 8:44 (UKJV) If your people go out to battle against their enemy, anywhere you shall send them, and shall pray unto the LORD toward the city which you have chosen, and toward the house that I have built for your name:

42nʼihi na ha ga-anụ ihe banyere aha ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a,

43mgbe ahụ, site nʼeluigwe ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Mekwaa ihe niile nke onye mba ọzọ ahụ na-arịọ nʼekpere, ka ndị niile nke ụwa mara aha gị, tụọkwa egwu gị, dịka ndị nke gị bụ Izrel na-eme, ka ha matakwa na-akpọkwasịrị Aha gị nʼụlọ a nke m wuru.

44“Mgbe ndị gị ga-aga ibu agha megide ndị iro ha, nʼebe ọbụla ị na-eziga ha, mgbe ha chere ihu ha nʼụzọ obodo a nke ị họpụtara na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị, kpee ekpere nye Onyenwe anyị,

45mgbe ahụ, site nʼeluigwe nụrụ ekpere na arịrịọ amara ha, mezukwa ihe ha na-arịọ (dịnyekwara ha).

46“Mgbe ha mehiere megide gị, nʼihi na ọ dịghị mmadụ ọbụla na-adịghị emehie, ị wee iwe megide ha, rara ha nyefee nʼaka ndị iro ha, ndị dọkpụrụ ha nʼagha gaa nʼobodo ọzọ, maọbụ obodo dị anya maọbụ nke dị nso;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.