1 Ndị Eze 8

Nʼihi na ha bụ ndị gị na oke gị, ndị i mere ka ha si nʼala Ijipt pụta, ala oke ịta ahụhụ nke nhụju anya.

1 Kings 8:51 (UKJV) For they be your people, and yours inheritance, which you brought forth out of Egypt, from the midst of the furnace of iron:

49mgbe ahụ, site nʼeluigwe, ebe obibi gị, nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha, nyekwara ha aka.

50Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị, gbaghara njehie niile ha mere megide gị, ma meekwa ka ndị dọtara ha nʼagha gosi ha obi ebere.

51Nʼihi na ha bụ ndị gị na oke gị, ndị i mere ka ha si nʼala Ijipt pụta, ala oke ịta ahụhụ nke nhụju anya.

52“Ka anya gị ghere oghe nʼarịrịọ mụ bụ ohu gị, nakwa nʼarịrịọ ndị gị Izrel, biko, na-egekwa ha ntị mgbe ọbụla ha bekuru gị akwa.

53Nʼihi na gị onwe gị kewapụtara ha site na mba niile nke ụwa ka ha bụụrụ gị ihe nketa, dịka ị kwupụtara site nʼọnụ ohu gị bụ Mosis, mgbe gị bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka nna nna anyị ha si nʼala Ijipt pụta.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.