1 Ndị Eze 8

Mgbe Solomọn kpechara ekpere ndị a ya na arịrịọ ọ rịọrọ Onyenwe anyị o si nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, bụ ebe o gburu ikpere nʼala, bilie, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu.

1 Kings 8:54 (UKJV) And it was so, that when Solomon had made an end of praying all this prayer and supplication unto the LORD, he arose from before the altar of the LORD, from kneeling on his knees with his hands spread up to heaven.

52“Ka anya gị ghere oghe nʼarịrịọ mụ bụ ohu gị, nakwa nʼarịrịọ ndị gị Izrel, biko, na-egekwa ha ntị mgbe ọbụla ha bekuru gị akwa.

53Nʼihi na gị onwe gị kewapụtara ha site na mba niile nke ụwa ka ha bụụrụ gị ihe nketa, dịka ị kwupụtara site nʼọnụ ohu gị bụ Mosis, mgbe gị bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka nna nna anyị ha si nʼala Ijipt pụta.”

54Mgbe Solomọn kpechara ekpere ndị a ya na arịrịọ ọ rịọrọ Onyenwe anyị o si nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, bụ ebe o gburu ikpere nʼala, bilie, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu.

55O guzoro gọzie ọgbakọ Izrel niile, gwa ha okwu nʼoke olu sị ha,

56“Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye nyere ndị ya, Izrel izuike dịka o kwere na nkwa. Ọ dịkwaghị okwu ọbụla nke na-emezughị nʼime ezi nkwa ahụ niile o kwere site nʼọnụ Mosis ohu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.