54Mgbe Solomọn kpechara ekpere ndị a ya na arịrịọ ọ rịọrọ Onyenwe anyị o si nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, bụ ebe o gburu ikpere nʼala, bilie, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu.
55O guzoro gọzie ọgbakọ Izrel niile, gwa ha okwu nʼoke olu sị ha,
56“Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye nyere ndị ya, Izrel izuike dịka o kwere na nkwa. Ọ dịkwaghị okwu ọbụla nke na-emezughị nʼime ezi nkwa ahụ niile o kwere site nʼọnụ Mosis ohu ya.
57Ka Onyenwe anyị Chineke anyị dịnyere anyị, dịka o si dịnyere nna nna anyị ha. Ka ọ gharakwa ịhapụ anyị, maọbụ gbakụta anyị azụ.
58Ya nyekwa anyị mmụọ ime ihe niile ọ chọrọ, dịka uche nsọ ya si dị, na mmụọ ijezi ije nʼụzọ ya niile, na idebe ụkpụrụ na iwu niile nke o nyere nna nna anyị ha.