56“Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye nyere ndị ya, Izrel izuike dịka o kwere na nkwa. Ọ dịkwaghị okwu ọbụla nke na-emezughị nʼime ezi nkwa ahụ niile o kwere site nʼọnụ Mosis ohu ya.
57Ka Onyenwe anyị Chineke anyị dịnyere anyị, dịka o si dịnyere nna nna anyị ha. Ka ọ gharakwa ịhapụ anyị, maọbụ gbakụta anyị azụ.
58Ya nyekwa anyị mmụọ ime ihe niile ọ chọrọ, dịka uche nsọ ya si dị, na mmụọ ijezi ije nʼụzọ ya niile, na idebe ụkpụrụ na iwu niile nke o nyere nna nna anyị ha.
59Ka okwu m ndị a niile, nke m ji rịọ amara nʼihu Onyenwe anyị dịkwa Onyenwe anyị Chineke anyị nso ehihie na abalị. Ka o nyekwara ohu ya na ndị Izrel niile aka, dịka mkpa ụbọchị ọbụla si dị.
60Ka ndị niile bi nʼụwa mara na Onyenwe anyị bụ Chineke, marakwa na o nweghị chi ọzọ dị karịa ya.